Jeremaya 13:5
Jeremiah 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
Jeremiah 13:5 in English
Jeremiah 13:5 · Berean Standard Bible
So I went and hid it at Perath, as the LORD had commanded me.
Context
3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, 4“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” 5Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m. 6Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.” 7Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.