Jeremaya 13:4
Jeremiah 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”
Jeremiah 13:4 in English
Jeremiah 13:4 · Berean Standard Bible
“Take the loincloth that you bought and are wearing, and go at once to Perath * and hide it there in a crevice of the rocks.”
Context
2Ejere m zụta ajị* ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m. 3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, 4“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” 5Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m. 6Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.