Native Bible

Jeremiah 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,

Jeremiah 13:3 in English

Jeremiah 13:3 · Berean Standard Bible

Then the word of the LORD came to me a second time:

Context

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.” 2Ejere m zụta ajị* ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m. 3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, 4“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” 5Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.