Jeremaya 13:26
Jeremiah 13:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
Jeremiah 13:26 in English
Jeremiah 13:26 · Berean Standard Bible
So I will pull your skirts up over your face, that your shame may be seen.
Context
24“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ,
nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị. 25Nke a bụ ihe unu fetara na nza,
oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Nʼihi na unu echefuola m,
tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche. 26Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị. 27Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị,
na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile!
Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile,
nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa.
Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem!
Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”
13:1 Maọbụ, ihe mgbado ukwu
13:2 Ọtụtụ ndị ọgbara ọhụrụ amaghị ihe bụ ajị, kama ọ bụ nke a na-akpọ belịt, maọbụ, ihe mgbado ukwu ma ọ bụkwanụ, ihe okike ka ha maara
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.