Jeremaya 13:24
Jeremiah 13:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.
Jeremiah 13:24 in English
Jeremiah 13:24 · Berean Standard Bible
“I will scatter you like chaff driven by the desert wind.
Context
22Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị,
“Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?”
Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị
ka e ji dọwaa uwe mwụda gị,
merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile. 23Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya?
Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa?
Nʼụzọ dị otu a kwa,
unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe. 24“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ,
nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị. 25Nke a bụ ihe unu fetara na nza,
oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Nʼihi na unu echefuola m,
tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche. 26Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.