Ndị Ikpe 9:48
Judges 9:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”
Judges 9:48 in English
Judges 9:48 · Berean Standard Bible
he and all his men went up to Mount Zalmon. Abimelech took his axe in his hand and cut a branch from the trees, which he lifted to his shoulder, saying to his men, “Hurry and do what you have seen me do.”
Context
46Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit. 47Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ, 48ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.” 49Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ. 50Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.