Ndị Ikpe 9:50
Judges 9:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya.
Judges 9:50 in English
Judges 9:50 · Berean Standard Bible
Then Abimelech went to Thebez, encamped against it, and captured it.
Context
48ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.” 49Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ. 50Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya. 51Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ. 52Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.