Native Bible

Judges 9:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit.

Judges 9:46 in English

Judges 9:46 · Berean Standard Bible

On hearing of this, all the leaders in the tower of Shechem entered the inner chamber of the temple of El-berith.*

Context

44Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ. 45Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile. 46Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit. 47Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ, 48ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.