Native Bible

Judges 9:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ,

Judges 9:47 in English

Judges 9:47 · Berean Standard Bible

And when Abimelech was told that all the leaders in the tower of Shechem were gathered there,

Context

45Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile. 46Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit. 47Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ, 48ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.” 49Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.