Ndị Ikpe 9:28
Judges 9:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?
Judges 9:28 in English
Judges 9:28 · Berean Standard Bible
Then Gaal son of Ebed said, “Who is Abimelech, and who is Shechem, that we should serve him? Is he not the son of Jerubbaal, and is not Zebul his officer? You are to serve the men of Hamor, the father of Shechem. Why should we serve Abimelech?
Context
26Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne* ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ. 27Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek. 28Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe? 29A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ” 30Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.