Native Bible

Judges 9:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.

Judges 9:30 in English

Judges 9:30 · Berean Standard Bible

When Zebul the governor of the city heard the words of Gaal son of Ebed, he burned with anger.

Context

28Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe? 29A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ” 30Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe. 31O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị. 32Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.