Native Bible

Judges 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne* ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.

Judges 9:26 in English

Judges 9:26 · Berean Standard Bible

Meanwhile, Gaal son of Ebed came with his brothers and crossed into Shechem, and the leaders of Shechem put their confidence in him.

Context

24Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya. 25Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme. 26Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne* ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ. 27Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek. 28Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.