Native Bible

Judges 9:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.

Judges 9:25 in English

Judges 9:25 · Berean Standard Bible

The leaders of Shechem set up an ambush against Abimelech on the hilltops, and they robbed all who passed by them on the road. So this was reported to Abimelech.

Context

23Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek. 24Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya. 25Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme. 26Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne* ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ. 27Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.