Ndị Ikpe 7:15
Judges 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”
Judges 7:15 in English
Judges 7:15 · Berean Standard Bible
When Gideon heard the dream and its interpretation, he bowed in worship. He returned to the camp of Israel and said, “Get up, for the LORD has delivered the camp of Midian into your hand.”
Context
13Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.” 14Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.” 15Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.” 16O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya. 17Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.