Native Bible

Judges 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.”

Judges 7:13 in English

Judges 7:13 · Berean Standard Bible

And as Gideon arrived, a man was telling his friend about a dream. “Behold, I had a dream,” he said, “and I saw a loaf of barley bread come tumbling into the Midianite camp. It struck the tent so hard that the tent overturned and collapsed.”

Context

11ṅaa ntị, nụrụ ihe ha na-ekwu. Emesịa, ị ga-abụ onye a gbara ume ibu agha megide ọmụma ụlọ ikwu ahụ.” Ya mere, ya na Pura onyeozi ya gara nʼebe dị nso, nʼebe ndị nche ọmụma ụlọ ikwu ahụ nọ. 12Ma lee, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na ndị obodo ndị ọzọ ahụ si nʼọwụwa anyanwụ bịa jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube. Nʼezie, ịnyịnya kamel ha dị ọtụtụ, dịka aja dị nʼakụkụ oke osimiri. 13Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.” 14Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.” 15Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.