Native Bible

Judges 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.

Judges 7:16 in English

Judges 7:16 · Berean Standard Bible

And he divided the three hundred men into three companies and gave each man a ram’s horn in one hand and a large jar in the other, containing a torch.*

Context

14Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.” 15Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.” 16O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya. 17Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere. 18Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere Onyenwe anyị, dịnyekwara Gidiọn.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.