Ndị Ikpe 5:15
Judges 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
Judges 5:15 in English
Judges 5:15 · Berean Standard Bible
The princes of Issachar were with Deborah, and Issachar was with Barak, rushing into the valley at his heels. In the clans of Reuben there was great indecision.*
Context
13“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara,
ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike. 14Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek,
ndị Benjamin sokwa pụta,
ndị ndu sikwa Makia bịa,
ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta. 15Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra.
E, Isaka sokwara Barak
na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya.
Ma nʼetiti ndị Ruben,
ha nọ na-atụgharị uche. 16Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ,
ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ?
Nʼetiti obodo niile nke Ruben,
ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche. 17Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.
Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha.
Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo
nʼakụkụ ọnụ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.