Native Bible

Judges 5:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.

Judges 5:17 in English

Judges 5:17 · Berean Standard Bible

Gilead remained beyond the Jordan. Dan, why did you linger by the ships? Asher stayed at the coast and remained in his harbors.

Context

15Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche. 16Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche. 17Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri. 18Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ. 19“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.