Ndị Ikpe 5:14
Judges 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
Judges 5:14 in English
Judges 5:14 · Berean Standard Bible
Some came from Ephraim, with their roots in Amalek; Benjamin came with your people after you. The commanders came down from Machir, the bearers of the marshal’s staff from Zebulun.
Context
12‘Teta, teta, gị Debọra!
Teta, teta, bụọ abụ.
Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie!
Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’ 13“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara,
ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike. 14Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek,
ndị Benjamin sokwa pụta,
ndị ndu sikwa Makia bịa,
ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta. 15Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra.
E, Isaka sokwara Barak
na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya.
Ma nʼetiti ndị Ruben,
ha nọ na-atụgharị uche. 16Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ,
ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ?
Nʼetiti obodo niile nke Ruben,
ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.