Ndị Ikpe 5:10
Judges 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ
Judges 5:10 in English
Judges 5:10 · Berean Standard Bible
You who ride white donkeys, who sit on saddle blankets, and you who travel the road, ponder
Context
8Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe,
mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile,
ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe.*
E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla. 9Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel.
Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel.
Toonu Onyenwe anyị! 10“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha,
unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu,
na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ.
Tụleenụ 11olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile.
Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị,
ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel.
“Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị
ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo. 12‘Teta, teta, gị Debọra!
Teta, teta, bụọ abụ.
Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie!
Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.