Native Bible

Judges 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.

Judges 5:11 in English

Judges 5:11 · Berean Standard Bible

the voices of the singers * at the watering places. There they shall recount the righteous acts of the LORD, the righteous deeds of His villagers * in Israel. Then the people of the LORD went down to the gates:

Context

9Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị! 10“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ 11olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo. 12‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’ 13“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.