Native Bible

Judges 16:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.

Judges 16:19 in English

Judges 16:19 · Berean Standard Bible

And having lulled him to sleep on her lap, she called a man to shave off the seven braids of his head. In this way she began to subdue him,* and his strength left him.

Context

17Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” 18Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha. 19Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya. 20O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya. 21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.