Ndị Ikpe 16:17
Judges 16:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”
Judges 16:17 in English
Judges 16:17 · Berean Standard Bible
Samson told her all that was in his heart: “My hair has never been cut, because I have been a Nazirite to God from my mother’s womb. If I am shaved, my strength will leave me, and I will become as weak as any other man.”
Context
15Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.” 16Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya. 17Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” 18Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha. 19Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.