Ndị Ikpe 14:1
Judges 14:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Samsin gbadara nʼobodo Timna* ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia.
Judges 14:1 in English
Judges 14:1 · Berean Standard Bible
One day Samson went down to Timnah, where he saw a young Philistine woman.
Context
1Samsin gbadara nʼobodo Timna* ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia. 2Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna* sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.” 3Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?”
Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.