Native Bible

Judges 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.

Judges 12:9 in English

Judges 12:9 · Berean Standard Bible

He had thirty sons, as well as thirty daughters whom he gave in marriage to men outside his clan; and for his sons he brought back thirty wives from elsewhere. Ibzan judged Israel seven years.

Context

7Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead. 8Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.* 9O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa. 10Ibzan nwụrụ, e lie ya na Betlehem. 11Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.