Aịzaya 8:20
Isaiah 8:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
Isaiah 8:20 in English
Isaiah 8:20 · Berean Standard Bible
To the law and to the testimony! If they do not speak according to this word, they have no light of dawn.
Context
18Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn. 19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ? 20Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha. 21Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha. 22Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.
8:6 Mmiri a, si nʼisi iyi Gaihọn na-asọbata nʼime Jerusalem, inye ndị bi nʼime obodo mmiri ọṅụṅụ 2Ih 32:4,30
8:10 Rom 8:31
8:12 Mgbe ndị Juda nụrụ ihe banyere njikọta aka dị nʼetiti ndị Izrel na Siria, nʼihi ibuso ha agha, oke egwu tụrụ ha.
8:14 Maọbụ, Ebe mgbaba
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.