Aịzaya 8:21
Isaiah 8:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha.
Isaiah 8:21 in English
Isaiah 8:21 · Berean Standard Bible
They will roam the land, dejected and hungry. When they are famished, they will become enraged; and looking upward, they will curse their king and their God.
Context
19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ? 20Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha. 21Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha. 22Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.
8:6 Mmiri a, si nʼisi iyi Gaihọn na-asọbata nʼime Jerusalem, inye ndị bi nʼime obodo mmiri ọṅụṅụ 2Ih 32:4,30
8:10 Rom 8:31
8:12 Mgbe ndị Juda nụrụ ihe banyere njikọta aka dị nʼetiti ndị Izrel na Siria, nʼihi ibuso ha agha, oke egwu tụrụ ha.
8:14 Maọbụ, Ebe mgbaba
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.