Aịzaya 8:18
Isaiah 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.
Isaiah 8:18 in English
Isaiah 8:18 · Berean Standard Bible
Here am I, and the children the LORD has given me * as signs and symbols in Israel from the LORD of Hosts, who dwells on Mount Zion.
Context
16Kechie ihe ịgba ama nke iwu a
kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya. 17Aga m echere Onyenwe anyị,
onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a.
Aga m atụkwasị obi m na ya. 18Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn. 19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ? 20Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.