Native Bible

Isaiah 8:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya.

Isaiah 8:16 in English

Isaiah 8:16 · Berean Standard Bible

Bind up the testimony and seal the law among my disciples.

Context

14Ọ ga-abụkwa ebe nsọ;* nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya. 15Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.” 16Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya. 17Aga m echere Onyenwe anyị, onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a. Aga m atụkwasị obi m na ya. 18Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.