Aịzaya 8:13
Isaiah 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.
Isaiah 8:13 in English
Isaiah 8:13 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts is the One you shall regard as holy. Only He should be feared; only He should be dreaded.
Context
11Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị: 12“Adịnyerela ha
nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị;
ka ihe ha na-atụ egwu
hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.* 13Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ.
Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ.
Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji. 14Ọ ga-abụkwa ebe nsọ;*
nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha
nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.
Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem
igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya. 15Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ;
ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara.
Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.