Aịzaya 8:12
Isaiah 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.*
Isaiah 8:12 in English
Isaiah 8:12 · Berean Standard Bible
“Do not call conspiracy everything these people regard as conspiracy. Do not fear what they fear;* do not live in dread.*
Context
10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya.
Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo
nʼihi na Chineke nọnyere anyị.* 11Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị: 12“Adịnyerela ha
nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị;
ka ihe ha na-atụ egwu
hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.* 13Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ.
Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ.
Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji. 14Ọ ga-abụkwa ebe nsọ;*
nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha
nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.
Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem
igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.