Aịzaya 63:15
Isaiah 63:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?
Isaiah 63:15 in English
Isaiah 63:15 · Berean Standard Bible
Look down from heaven and see, from Your holy and glorious habitation. Where are Your zeal and might? Your yearning and compassion for me are restrained.
Context
13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?
Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,
ike agwụghị ha. 14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu,
Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike.
Otu a ka i si duo ndị gị,
ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ. 15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe,
ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya.
Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị?
Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa? 16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,
a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị
maọbụ Izrel agọnarị anyị,
gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị,
onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo
na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị?
Lọghachi nʼihi ndị ohu gị,
nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.