Aịzaya 63:14
Isaiah 63:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Isaiah 63:14 in English
Isaiah 63:14 · Berean Standard Bible
Like cattle going down to the valley, the Spirit of the LORD gave them rest. You led Your people this way to make for Yourself a glorious name.
Context
12Olee onye ahụ ike ya
mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha,
mgbe Mosis weliri aka ya elu,
meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi? 13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?
Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,
ike agwụghị ha. 14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu,
Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike.
Otu a ka i si duo ndị gị,
ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ. 15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe,
ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya.
Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị?
Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa? 16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,
a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị
maọbụ Izrel agọnarị anyị,
gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị,
onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.