Aịzaya 63:12
Isaiah 63:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?
Isaiah 63:12 in English
Isaiah 63:12 · Berean Standard Bible
who sent His glorious arm to lead them by the right hand of Moses, who divided the waters before them to gain for Himself everlasting renown,
Context
10Ma ha nupuru isi megide ya,
meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ.
Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha,
lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya. 11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga,
ụbọchị Mosis na ndị nke ya.
Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta,
ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya?
Olee ebe onye ahụ tinyere
Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ. 12Olee onye ahụ ike ya
mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha,
mgbe Mosis weliri aka ya elu,
meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi? 13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?
Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,
ike agwụghị ha. 14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu,
Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike.
Otu a ka i si duo ndị gị,
ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.