Aịzaya 63:11
Isaiah 63:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga, ụbọchị Mosis na ndị nke ya. Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta, ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya? Olee ebe onye ahụ tinyere Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.
Isaiah 63:11 in English
Isaiah 63:11 · Berean Standard Bible
Then His people remembered the days of old, the days of Moses. Where is He who brought them through the sea with the shepherds of His flock? Where is the One who set His Holy Spirit among them,
Context
9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya,
ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha.
Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha,
bulie ha elu, kuru ha
ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga. 10Ma ha nupuru isi megide ya,
meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ.
Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha,
lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya. 11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga,
ụbọchị Mosis na ndị nke ya.
Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta,
ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya?
Olee ebe onye ahụ tinyere
Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ. 12Olee onye ahụ ike ya
mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha,
mgbe Mosis weliri aka ya elu,
meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi? 13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?
Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,
ike agwụghị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.