Aịzaya 63:9
Isaiah 63:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
Isaiah 63:9 in English
Isaiah 63:9 · Berean Standard Bible
In all their distress, He too was afflicted, and the Angel of His Presence * saved them. In His love and compassion He redeemed them; He lifted them up and carried them all the days of old.
Context
7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị.
Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere.
Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ,
e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel,
nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị. 8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m;
e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.”
Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta. 9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya,
ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha.
Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha,
bulie ha elu, kuru ha
ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga. 10Ma ha nupuru isi megide ya,
meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ.
Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha,
lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya. 11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga,
ụbọchị Mosis na ndị nke ya.
Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta,
ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya?
Olee ebe onye ahụ tinyere
Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.