Aịzaya 59:17
Isaiah 59:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.
Isaiah 59:17 in English
Isaiah 59:17 · Berean Standard Bible
He put on righteousness like a breastplate, and the helmet of salvation on His head; He put on garments of vengeance and wrapped Himself in a cloak of zeal.
Context
15E, eziokwu alaala;
onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu.
Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ;
ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị. 16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla;
o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya,
bịa ịzọpụta anyị. 17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya.
Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya.
Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo
na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya. 18Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya
dịka ajọ omume ha niile si dị.
Iwe ọkụ ya
ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile
bi na mba dị anya. 19Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị,
sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya.
Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri
nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.