Aịzaya 59:18
Isaiah 59:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.
Isaiah 59:18 in English
Isaiah 59:18 · Berean Standard Bible
So He will repay according to their deeds: fury to His enemies, retribution to His foes, and recompense to the islands.*
Context
16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla;
o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya,
bịa ịzọpụta anyị. 17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya.
Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya.
Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo
na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya. 18Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya
dịka ajọ omume ha niile si dị.
Iwe ọkụ ya
ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile
bi na mba dị anya. 19Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị,
sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya.
Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri
nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.* 20“Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn;
ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.