Aịzaya 52:2
Isaiah 52:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
Isaiah 52:2 in English
Isaiah 52:2 · Berean Standard Bible
Shake off your dust! Rise up and sit on your throne, O Jerusalem. Remove the chains from your neck, O captive Daughter of Zion.
Context
1Teta, teta gị Zayọn,
yikwasị onwe gị ike dịka uwe!
Yikwasị onwe gị uwe mara mma,
gị Jerusalem, obodo dị nsọ.
Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ
agaghị abata nʼime gị ọzọ. 2Kụchapụ aja dị nʼahụ gị,
bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị.
Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu,
gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha. 3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla,
ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.” 4Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri,
ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.