Native Bible

Isaiah 48:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’

Isaiah 48:7 in English

Isaiah 48:7 · Berean Standard Bible

They are created now, and not long ago; you have not heard of them before today. So you cannot claim, ‘I already knew them!’

Context

5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’ 6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ. 7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’ 8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya. 9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.