Native Bible

Isaiah 48:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.

Isaiah 48:9 in English

Isaiah 48:9 · Berean Standard Bible

For the sake of My name I will delay My wrath; for the sake of My praise I will restrain it, so that you will not be cut off.

Context

7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’ 8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya. 9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam. 10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ. 11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.