Aịzaya 48:8
Isaiah 48:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.
Isaiah 48:8 in English
Isaiah 48:8 · Berean Standard Bible
You have never heard; you have never understood; for a long time your ears have not been open. For I knew how deceitful you are; you have been called a rebel from birth.
Context
6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu.
“Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ
nke m na-agwabeghị unu na mbụ. 7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie.
Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ,
ya mere, unu agaghị asị,
‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’ 8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa,
site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe.
Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya. 9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ
nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ,
ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam. 10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ.
E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.