Aịzaya 48:5
Isaiah 48:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’
Isaiah 48:5 in English
Isaiah 48:5 · Berean Standard Bible
Therefore I declared it to you long ago; I announced it before it came to pass, so that you could not claim, ‘My idol has done this; my carved image and molten god has ordained it.’
Context
3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
Mgbe m kwupụrụ ya,
emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo. 4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike,
matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji.
Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz. 5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga
ihe m gaje ime,
ka unu ghara ị sị,
‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya.
Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’ 6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu.
“Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ
nke m na-agwabeghị unu na mbụ. 7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie.
Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ,
ya mere, unu agaghị asị,
‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.