Aịzaya 48:4
Isaiah 48:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.
Isaiah 48:4 in English
Isaiah 48:4 · Berean Standard Bible
For I knew that you are stubborn; your neck is iron and your forehead is bronze.
Context
2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ,
ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel.
Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
Mgbe m kwupụrụ ya,
emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo. 4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike,
matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji.
Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz. 5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga
ihe m gaje ime,
ka unu ghara ị sị,
‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya.
Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’ 6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu.
“Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ
nke m na-agwabeghị unu na mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.