Aịzaya 43:5
Isaiah 43:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.
Isaiah 43:5 in English
Isaiah 43:5 · Berean Standard Bible
Do not be afraid, for I am with you; I will bring your offspring from the east and gather you from the west.
Context
3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. 4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ. 5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ
na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. 6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
‘Hapụnụ ha ka ha laa,
unu egbochikwala ha.’
Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi, 7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,
onye m kere nʼihi otuto m,
onye m kpụrụ, ma meekwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.