Aịzaya 43:4
Isaiah 43:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
Isaiah 43:4 in English
Isaiah 43:4 · Berean Standard Bible
Because you are precious and honored in My sight, and because I love you, I will give men in exchange for you and nations in place of your life.
Context
2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. 3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. 4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ. 5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ
na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. 6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
‘Hapụnụ ha ka ha laa,
unu egbochikwala ha.’
Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.