Native Bible

Isaiah 43:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.

Isaiah 43:4 in English

Isaiah 43:4 · Berean Standard Bible

Because you are precious and honored in My sight, and because I love you, I will give men in exchange for you and nations in place of your life.

Context

2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. 3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel. Ewerela m Ijipt na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. 4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ. 5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. 6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.