Aịzaya 43:2
Isaiah 43:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
Isaiah 43:2 in English
Isaiah 43:2 · Berean Standard Bible
When you pass through the waters, I will be with you; and when you go through the rivers, they will not overwhelm you. When you walk through the fire, you will not be scorched; the flames will not set you ablaze.
Context
1Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye kere gị, Jekọb,
na onye kpụrụ gị Izrel,
“Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.
Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m. 2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. 3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. 4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.