Aịzaya 43:1
Isaiah 43:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.
Isaiah 43:1 in English
Isaiah 43:1 · Berean Standard Bible
Now this is what the LORD says— He who created you, O Jacob, and He who formed you, O Israel: “Do not fear, for I have redeemed you; I have called you by your name; you are Mine!
Context
1Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye kere gị, Jekọb,
na onye kpụrụ gị Izrel,
“Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.
Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m. 2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. 3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.