Aịzaya 43:7
Isaiah 43:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”
Isaiah 43:7 in English
Isaiah 43:7 · Berean Standard Bible
everyone called by My name and created for My glory, whom I have indeed formed and made.”
Context
5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ
na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. 6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
‘Hapụnụ ha ka ha laa,
unu egbochikwala ha.’
Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi, 7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,
onye m kere nʼihi otuto m,
onye m kpụrụ, ma meekwa.” 8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,
ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe. 9Mba niile dị iche iche ezukọtala,
mmadụ niile agbakọtakwala.
Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme,
onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga?
Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi,
ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.