Aịzaya 42:9
Isaiah 42:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”
Isaiah 42:9 in English
Isaiah 42:9 · Berean Standard Bible
Behold, the former things have happened, and now I declare new things. Before they spring forth I proclaim them to you.”
Context
7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha. 8“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m.
Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m.
Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m. 9Lee ihe ochie emezuola
ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta.
Tupu ha pụta ìhè
ana m akpọsa ha nye unu.” 10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya,
unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa,
unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya.
Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. 11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu,
ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ.
Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ,
ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.